Isaiah 50

Mmehie Izrel na nrube isi nke ohu ahụ

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị
bụ nke m ji chụpụ ya?
Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ
ka m resiri unu?
Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu;
nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.
2Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara?
Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku?
Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu?
Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta?
Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ.
Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara,
ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ
nʼihi enweghị mmiri.
3Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe,
ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”

4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya
ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,
meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,
ma enupughị m isi,
a tụgharịkwaghị m azụ.
6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;
agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.
Ezopụghị m ihu m
nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.
7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,
ihere agaghị eme m.
Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,
a maara m na ihere agaghị eme m.
8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.
Onye ga-apụta ibo m ebubo?
Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!
Onye nwere ebubo megide m?
Ya bịa ka anyị kwuo ya.
9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.
Onye pụrụ ịma m ikpe?
Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,
nla ga-erichapụkwa ha.

10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,
na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya?
Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị,
nke na-enweghị ìhè ọbụla,
tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị
daberekwa na Chineke ha.
11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ,
ndị meere onwe ha ọwaọkụ,
nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị,
gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu.
Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị
bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.
Copyright information for IboBIU